Efere Iri Ihe Na-Enye Ahụike (Igbo)

Efere iri ihe na- enye ahụike, bụ nke ndị Ọkachamara n’ ihe gbasara ezigbo nri n’ ụlọakwụkwọ “Harvard T.H. Chan School of Public Health and Editors” n’ akwụkwọ nzisa ozi Harvard Health kepụtara, bụ usoro e si ekewasi ahụike, nri zụrụ ọke—ma etinyere ya n’ efere ma ọ bụ kechie ya n’ igbe nri ehihie. Tinye otu ibe akwụkwọ ya n’ ime njụoyi (Fiiriiji) iji chetara gị n’ ụbọchị ọ bụla ikepụta ahụike, nri zuru oke.

Nke a bụ maka kọlọ n’ udi dị iche iche, ma chetakwa na Ji nwannụ (peetọtọ) abụghị akwụkwọ nri n’ ime efere ihe na -enye ahụike n’ ihi ọrụ ọjọọ ya n’ ọbara.

Nri mkpụrụ ọka ndị dịka: (whole wheat, barley, wheat berries, quinoa, brown rice) na nri ndị e ji ha mee dịka wheat pasta—nwere obere nsogbu n’ ime ọbara suga na nkụmiilu karịa ihe achịcha ọcha, osikapa ọcha na ụmụ mkpụrụ ọka ndị ọzọ.

Azụ, anụ ọkụkọ, agwa na nọọtụs(nuts) dịcha mma, e si na ha enweta protin—e nwere ike tinye ha n’ ime saaladi ọ ga-aga nke ọma ya na akwụkwọ nri n’ efere. Belata aka n’ iri anụ nama, sọrọ anụ ndị e jiri mee ihe ọtịta na sọsọeji.

Họrọ mmanụ nri ahụike dịka ọliiv (olive) kanọla (canola) soo (soy) ọka, sọọnụ fụlawa (sunflower) mkpụrụ kashuu (peanut) na ndị ọzọ jisie ike zere ụfọdụ mmanụ ndị na-enweghi ihe ha na-enye n’ ahụ ma nwee abụba. Chetakwa na abụba ilotu abụghị ịdị ike.

Wufere ihe ọńụńụ ọtọbịrịbịrị, mara etu I si ańụ mmiri ara ehi, belata aka n’ mmiri mkpụrụ osisi ka ọ bụrụ ọkara iko n’ ụbọchị.

Akara ọbara ọbara ahụ gara efere iri ihe na- enye ahụ ike gburugburu bụ iji cheta na ịkwụrụ chịm dịkwa mkpa n’ iji mara etu anyi ha.

Ihe dị mkpa n’ ozi iri ihe na- enye ahụ ike bụ ileba anya n’ ezigbo nri.

Link nội dung: https://cdspvinhlong.edu.vn/bu-to-a21940.html